47Ndị a bụ agbụrụ Asha. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).
48Ụmụ ụmụ Naftalị dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Jaziil, site na Jaziil, ikwu Guni, site na Guni,
49ikwu Jeza, site na Jeza, ikwu Shilem, site na Shilem.
50Ndị a si nʼagbụrụ Naftalị. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị anọ (45,400).
51Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom niile tozuru ije agha nʼIzrel dị narị puku isii, otu puku na narị asaa, na iri atọ (601,730).