52Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
53“Ị ga-ekenye ha ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha dịka ọnụọgụgụ aha ha si dị.
54Ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ ga-eketa ala dị ukwuu, ma ndị dị nta ga-eketa ala dị nta. Ihe nketa nke onye ọbụla ga-enweta ga-adị ka ọnụọgụgụ ahụ e dere.
55Lezie anya hụ na e kesara ala ahụ site nʼife nza. Ala ndị ọbụla ga-eketa ga-abụ dịka aha nna ochie ebo ha si dị.
56A ga-esite nʼife nza kenye ndị ọbụla ihe nketa nke ha dịka ịdị ukwuu maọbụ ịdị nta ha si dị.”