56A ga-esite nʼife nza kenye ndị ọbụla ihe nketa nke ha dịka ịdị ukwuu maọbụ ịdị nta ha si dị.”
57Ndị a bụ ndị Livayị a gụrụ ọnụ dịka ikwu ha si dị, ikwu Geshọn, site na Geshọn, ikwu Kohat, site na Kohat, ikwu Merari, site na Merari.
58Ndị a sikwa nʼagbụrụ Livayị: ikwu Libni, ikwu Hebrọn, ikwu Mahali, ikwu Mushi, na ikwu Kora. (Kohat bụ nna nna Amram.
59Aha nwunye Amram bụ Jekobed, nwa nwa Livayị, onye a mụrụ nʼagbụrụ ndị Livayị nʼIjipt. Ọ mụtaara Amram ụmụ ndị a: Erọn na Mosis, na Miriam, nwanne ha nwanyị.
60Erọn mụtara Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.