58Ndị a sikwa nʼagbụrụ Livayị: ikwu Libni, ikwu Hebrọn, ikwu Mahali, ikwu Mushi, na ikwu Kora. (Kohat bụ nna nna Amram.
59Aha nwunye Amram bụ Jekobed, nwa nwa Livayị, onye a mụrụ nʼagbụrụ ndị Livayị nʼIjipt. Ọ mụtaara Amram ụmụ ndị a: Erọn na Mosis, na Miriam, nwanne ha nwanyị.
60Erọn mụtara Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
61Ma Nadab na Abihu nwụrụ mgbe ha chere ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị.)
62Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ (23,000). Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha.