62Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ (23,000). Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha.
63Ya mere, ndị a bụ nchọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Izrel, dịka Mosis na Elieza onye nchụaja kwadobere gụọ na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.
64Ma nʼetiti ndị a, o nweghị otu onye ọbụla Mosis na Erọn onye nchụaja gụrụ nʼọnụọgụgụ mgbe ha gụrụ ndị Izrel ọnụ nʼọzara Saịnaị.
65Nʼihi na Onyenwe anyị gwara ndị Izrel ahụ na ha ga-anwụ nʼime ọzara ahụ. Naanị ndị a hapụrụ ndụ bụ Kaleb, nwa Jefune, na Joshua nwa Nun.