2nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, guzo nʼihu Mosis, na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu niile na ọgbakọ Izrel niile kwuo sị,
3“Nna anyị Zelofehad nwụrụ nʼọzara ma ọ bụghị otu nʼime ndị sonyere Kora, bụ ndị ahụ zukọtara megide Onyenwe anyị. Ọ nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie nke ya. Ma otu ọ dị, ọ mụtaghị nwoke.
4Gịnị ga-eme a ga-eji hichapụ aha nna anyị site nʼagbụrụ ya nʼihi na ọ mụtaghị nwoke? Ọ bụ uche anyị na e kwesiri ikenye anyị oke nʼoge a na-enye ụmụnne nna anyị oke.”
5Ya mere, Mosis butere mkpa ha nʼihu Onyenwe anyị.
6Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya,