Ọnụọgụgụ 28

Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, ọ bụ lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtara ya na mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka. A ga-eji ha chụọ aja nsure ọkụ nke isisi ya ga-atọkwa Onyenwe anyị ezi ụtọ.

Numbers 28:13 (UKJV) And a several tenth deal of flour mingled with oil for a food offering unto one lamb; for a burnt offering of a sweet savour, a sacrifice made by fire unto the LORD.

11“ ‘Ọzọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa ọbụla, a ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ dị iche, nke a ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ.

12Tinyere oke ehi ọbụla, ị ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwara mmanụ chụọ aja. Ma lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtakwara mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka maka otu ebule ọbụla.

13Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, ọ bụ lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtara ya na mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka. A ga-eji ha chụọ aja nsure ọkụ nke isisi ya ga-atọkwa Onyenwe anyị ezi ụtọ.

14Aja ọbụla a chụrụ ga-enwe aja ihe ọṅụṅụ nke ga-eso ya, lita mmanya abụọ maka otu oke ehi, ihe ji ntakịrị karịa otu lita mmanya nʼisi otu ebule, na otu lita nʼisi otu nwa atụrụ. Nke a ga-abụ aja nsure ọkụ nke a ga-achụ nʼoge ọnwa ọhụrụ ọ bụla, nʼime afọ ọbụla,

15nʼagbanyeghị aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị, a ga-eche otu mkpi nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mmehie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.