Ọnụọgụgụ 28

Unu ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara naanị otu afọ, otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.

Numbers 28:19 (UKJV) But all of you shall offer a sacrifice made by fire for a burnt offering unto the LORD; two young bullocks, and one ram, and seven lambs of the first year: they shall be unto you without blemish:

17Nʼụbọchị na-eso ya, bụ abalị iri na ise nke ọnwa ahụ ka a ga-eme mmemme. Nʼime abalị asaa ka a ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.

18Nʼụbọchị mbụ mmemme a bidoro, a ga-akpọ nzukọ dị nsọ nke ndị Izrel niile. Ọ dịghị ọrụ siri ike a ga-arụ nʼụbọchị ahụ.

19Unu ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara naanị otu afọ, otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.

20Nʼisi otu oke ehi ọbụla, a ga-achụ aja mkpụrụ ọka nke a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, a gwakọtara ya na mmanụ chụọ. Nʼisi ebule ọbụla, lita ụtụ ọka anọ na ọkara.

21Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, a ga-enye lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.