Ọnụọgụgụ 28

Nʼụbọchị na-eso ya, bụ abalị iri na ise nke ọnwa ahụ ka a ga-eme mmemme. Nʼime abalị asaa ka a ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.

Numbers 28:17 (UKJV) And in the fifteenth day of this month is the feast: seven days shall unleavened bread be eaten.

15nʼagbanyeghị aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị, a ga-eche otu mkpi nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mmehie.

16“ ‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka a ga-edebe Mmemme Ngabiga. Onyenwe anyị.

17Nʼụbọchị na-eso ya, bụ abalị iri na ise nke ọnwa ahụ ka a ga-eme mmemme. Nʼime abalị asaa ka a ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.

18Nʼụbọchị mbụ mmemme a bidoro, a ga-akpọ nzukọ dị nsọ nke ndị Izrel niile. Ọ dịghị ọrụ siri ike a ga-arụ nʼụbọchị ahụ.

19Unu ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara naanị otu afọ, otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.