Ọnụọgụgụ 28

Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.

Numbers 28:25 (UKJV) And on the seventh day all of you shall have an holy convocation; all of you shall do no servile work.

23A ga-achụ aja ndị a, tinyere aja ndị ọzọ niile a na-achụ nʼụbọchị niile.

24A ga-achụ aja ndị a ụbọchị niile nʼime ụbọchị asaa nke mmemme ahụ. Ha ga-abụ aja nke isisi ha dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. A ga-achụ ha, chụkwaa aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị.

25Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.

26“ ‘Nʼụbọchị mbụ nke mkpụrụ mbụ, mgbe unu na-eche onyinye ọka ọhụrụ unu nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme Izu Asaa, nweenụ mkpọkọta dị nsọ. Unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.

27Unu ga-achụ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị. Ọ bụ ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ka a ga-eji chụọ aja a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.