3Sị ha, ‘Nke a bụ onyinye unu na-enye site nʼọkụ nke unu na-eche nʼihu Onyenwe anyị: ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ, ka e jiri ha chụọ aja nsure ọkụ kwa ụbọchị niile.
4Chụọ otu nwa atụrụ nʼoge ụtụtụ, chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi.
5Ị ga-ejikwa lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja mkpụrụ ọka.
6Nke a bụ aja nsure ọkụ ahụ Onyenwe anyị nyere iwu ya nʼugwu Saịnaị na a ga na-achụrụ ya mgbe niile, dịka aja isisi ya dị ezi mma, aja nke a chụrụ site nʼọkụ nye Onyenwe anyị.
7Mmanya ga-eso aja a ga-abụ otu lita mmanya gbara ụka nʼisi otu atụrụ ọbụla, ị ga-awụsa aja ihe ọṅụṅụ a nʼebe nsọ nye Onyenwe anyị.