Ọnụọgụgụ 29

“ ‘Ụbọchị unu ga-egbu opi ike ga-adị nʼabalị mbụ nke ọnwa asaa nʼafọ ọbụla. Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke mmadụ niile. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.

Numbers 29:1 (UKJV) And in the seventh month, on the first day of the month, all of you shall have an holy convocation; all of you shall do no servile work: it is a day of blowing the trumpets unto you.

1“ ‘Ụbọchị unu ga-egbu opi ike ga-adị nʼabalị mbụ nke ọnwa asaa nʼafọ ọbụla. Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke mmadụ niile. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.

2Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụ aja nsure ọkụ a ga-eji otu oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ. Nke a bụ aja na-adị Onyenwe anyị ezi mma, ma na-esi ya isi ụtọ.

3Aja mkpụrụ ọka ka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi oke ehi ahụ, lita anọ na ọkara, nʼisi ebule,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.