15ma lita abụọ nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
16Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
17“ ‘Nʼụbọchị abụọ nke mmemme a, a ga-eji oke ehi iri na abụọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
18Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha, bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
19Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.