32“ ‘Nʼụbọchị nke asaa nke mmemme ahụ, were ụmụ oke ehi asaa, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
33Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
34Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
35“ ‘Nʼụbọchị nke asatọ ndị Izrel niile ga-enwe oke nzukọ. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
36Chụọ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. Ị ga-eji otu nwa oke ehi, otu ebule na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, chụọ ya.