Ọnụọgụgụ 29

“ ‘Nʼụbọchị nke asatọ ndị Izrel niile ga-enwe oke nzukọ. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.

Numbers 29:35 (UKJV) On the eighth day all of you shall have a solemn assembly: all of you shall do no servile work therein:

33Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.

34Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.

35“ ‘Nʼụbọchị nke asatọ ndị Izrel niile ga-enwe oke nzukọ. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.

36Chụọ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. Ị ga-eji otu nwa oke ehi, otu ebule na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, chụọ ya.

37Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.