3Aja mkpụrụ ọka ka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi oke ehi ahụ, lita anọ na ọkara, nʼisi ebule,
4na lita abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla.
5Tinyere otu mkpi a ga-eji chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu.
6Aja ndị a niile bụ nke a ga-etinye nye nʼaja nsure ọkụ a na-achụ kwa ọnwa, na aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, ha na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e depụtara. Ha bụ aja ihe oriri a na-achụrụ Onyenwe anyị, aja nwere isisi dị ụtọ.
7“ ‘Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwekwa nzukọ dị nsọ. Unu ga-ebudata onwe unu nʼala. O nweghịkwa ụdị ọrụ ọbụla unu ga-arụ.