1Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Erọn na Mosis nʼoge Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị.
2Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, Nadab, ọkpara ya, Abihu, Elieza na Itama.
3Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, ndị e tere mmanụ ịbụ ndị nchụaja, ndị e doro nsọ nʼihi ije ozi dịka ndị nchụaja.