20Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị: Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị agbụrụ Livayị, dịka ezinaụlọ ha si dị.
21Ndị Geshọn bụ ndị ikwu Libni na Shimei. Ndị a bụ ndị ikwu Geshọn.
22Ọnụọgụgụ ndị ikom dị otu ọnwa gbagoo dị puku asaa na narị ise (7,500).
23Ndị ikwu Geshọn mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼazụ ụlọ nzute.
24Onyendu ezinaụlọ ndị Geshọn bụ Eliasaf nwa Lael.