22Ọnụọgụgụ ndị ikom dị otu ọnwa gbagoo dị puku asaa na narị ise (7,500).
23Ndị ikwu Geshọn mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼazụ ụlọ nzute.
24Onyendu ezinaụlọ ndị Geshọn bụ Eliasaf nwa Lael.
25Ọrụ dịrị ụmụ Geshọn bụ ilekọta ụlọ nzute ahụ, na ụlọ ikwu ya, na ihe mkpuchi ya, na akwa mgbochi ọnụ ụzọ ụlọ nzute.
26Ọ dịkwa ha nʼaka ilekọta akwa mgbochi niile nke ogige gbara ya gburugburu, na akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ha nwekwara ọrụ ilekọta ebe ịchụ aja, na ụdọ niile, na ozi niile metụtara ihe ndị a.