Ọnụọgụgụ 3

Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Merari bụ Zuniel nwa Abihail. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ.

Numbers 3:35 (UKJV) And the chief of the house of the father of the families of Merari was Zuriel the son of Abihail: these shall pitch on the side of the tabernacle northward.

33Ndị Merari bụ ikwu Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị ikwu Merari.

34Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku isii na narị abụọ (6,200).

35Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Merari bụ Zuniel nwa Abihail. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ.

36Ọrụ e tinyere nʼaka ndị ikwu Merari bụ ilekọta mbudo niile nke ụlọ nzute ahụ, na mkpọrọ ya niile, ụkwụ ya niile, na ngwongwo niile e kwesiri iji rụọ ọrụ metụtara ha.

37Ọrụ ndị ọzọ bụ ilekọta ogidi osisi niile dị gburugburu ogige ahụ ha na ụkwụ ha, ǹtu na ụdọ ha niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.