39Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom Livayị niile Mosis na Erọn nwetara mgbe a gụrụ ha ọnụ nʼikwu nʼikwu dịka iwu Onyenwe anyị nyere ha si dị, bụ iri puku abụọ na puku abụọ (22,000). Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị site nʼotu ọnwa gaa nʼihu.
40Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Gụọ ndị ikom Izrel niile e buru ụzọ mụọ, ndị dị site nʼotu ọnwa gbagoo. Chọpụta ọnụọgụgụ ha, dee aha ha niile nʼakwụkwọ.
41Nabata ndị Livayị ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụrụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ọzọkwa, anụ ụlọ ndị Livayị niile bụ nke m, nʼọnọdụ ụmụ mbụ nke anụ ụlọ niile a mụrụ nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel niile. Abụ m Onyenwe anyị.”
42Ya mere, Mosis gụrụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼIzrel, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu,
43chọpụta na ọnụọgụgụ ndị ikom e buru ụzọ mụọ site nʼonye dị otu ọnwa ruo nʼokenye dị iri puku abụọ na puku abụọ na narị abụọ na iri asaa na atọ (22,273).