Ọnụọgụgụ 3

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Gụọ ndị ikom Izrel niile e buru ụzọ mụọ, ndị dị site nʼotu ọnwa gbagoo. Chọpụta ọnụọgụgụ ha, dee aha ha niile nʼakwụkwọ.

Numbers 3:40 (UKJV) And the LORD said unto Moses, Number all the firstborn of the males of the children of Israel from a month old and upward, and take the number of their names.

38Mpaghara akụkụ ọwụwa anyanwụ nʼihu ụlọ nzute ahụ ka e debere maka ụlọ ikwu Mosis na Erọn, na nke ụmụ ya ndị ikom. Ọrụ ha bụ ilekọta ebe nsọ ahụ nʼaha ụmụ Izrel niile. Onye ọbụla ọzọ bịara ebe nsọ ahụ nso ka a ga-egbu.

39Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom Livayị niile Mosis na Erọn nwetara mgbe a gụrụ ha ọnụ nʼikwu nʼikwu dịka iwu Onyenwe anyị nyere ha si dị, bụ iri puku abụọ na puku abụọ (22,000). Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị site nʼotu ọnwa gaa nʼihu.

40Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Gụọ ndị ikom Izrel niile e buru ụzọ mụọ, ndị dị site nʼotu ọnwa gbagoo. Chọpụta ọnụọgụgụ ha, dee aha ha niile nʼakwụkwọ.

41Nabata ndị Livayị ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụrụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ọzọkwa, anụ ụlọ ndị Livayị niile bụ nke m, nʼọnọdụ ụmụ mbụ nke anụ ụlọ niile a mụrụ nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel niile. Abụ m Onyenwe anyị.”

42Ya mere, Mosis gụrụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼIzrel, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.