47bụ ego ruru shekel ise, na isi onye ọbụla, ụdị shekel ebe nsọ, nke ọtụtụ ya bụ iri gera abụọ.
48Were ego mgbapụta a nye Erọn na ụmụ ndị ikom ya.”
49Ya mere, Mosis natara ego mgbapụta ahụ nʼisi onye ọbụla dị nʼọnụọgụgụ ndị ahụ mara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị.
50Ego niile ọ natara site nʼaka ndị ikom Izrel niile e bụ ụzọ mụọ bụ ọlaọcha ruru puku shekel na narị shekel atọ na iri isii na ise (1,365), dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị.
51Mosis nyere Erọn na ụmụ ya ego mgbapụta ndị a dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.