Ọnụọgụgụ 3

bụ ego ruru shekel ise, na isi onye ọbụla, ụdị shekel ebe nsọ, nke ọtụtụ ya bụ iri gera abụọ.

Numbers 3:47 (UKJV) You shall even take five shekels apiece by the poll, after the shekel of the sanctuary shall you take them: (the shekel is twenty gerahs:)

45“Nye m ndị Livayị nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Nyekwa m anụ ụlọ ndị Livayị niile nʼọnọdụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ndị Livayị bụ nke m. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

46Ihe a ga-eji gbara narị ụmụ ndị ikom Izrel abụọ na iri ndị ikom asaa, na atọ (273) ndị e buru ụzọ mụọ mapụtara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị

47bụ ego ruru shekel ise, na isi onye ọbụla, ụdị shekel ebe nsọ, nke ọtụtụ ya bụ iri gera abụọ.

48Were ego mgbapụta a nye Erọn na ụmụ ndị ikom ya.”

49Ya mere, Mosis natara ego mgbapụta ahụ nʼisi onye ọbụla dị nʼọnụọgụgụ ndị ahụ mara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.