Ọnụọgụgụ 3

Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,

Numbers 3:5 (UKJV) And the LORD spoke unto Moses, saying,

3Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, ndị e tere mmanụ ịbụ ndị nchụaja, ndị e doro nsọ nʼihi ije ozi dịka ndị nchụaja.

4Ma Onyenwe anyị mere ka Nadab na Abihu nwụọ, nʼihu ya nʼime ọzara Saịnaị, mgbe ha ji ọkụ na-adịghị nsọ wetara ya onyinye. Ebe ọ bụ na ha amụtaghị ụmụ ndị ikom nke aka ha, ọ bụ naanị Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja ogologo ụbọchị ndụ nna ha bụ Erọn.

5Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,

6“Kpọkọtaa ebo Livayị niile were ha nyefee Erọn onye nchụaja nʼaka, ka ha bụrụ ndị inyeaka ya.

7Ha ga-ejere ya na nzukọ Izrel niile ozi nʼụlọ nzute ahụ site na ịrụ ọrụ metụtara ebe obibi ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.