5Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
6“Kpọkọtaa ebo Livayị niile were ha nyefee Erọn onye nchụaja nʼaka, ka ha bụrụ ndị inyeaka ya.
7Ha ga-ejere ya na nzukọ Izrel niile ozi nʼụlọ nzute ahụ site na ịrụ ọrụ metụtara ebe obibi ahụ.
8Ha ga-elekọta ngwongwo ụlọ nzute, rụọ ọrụ metụtara ndị Izrel niile mgbe ha na-eje ozi ha nʼebe obibi ahụ.
9Were ndị Livayị nyefee Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼaka. Ọ bụ ha ka a ga-esi nʼetiti ụmụ Izrel nyefee ha nʼaka kpamkpam.