2Mgbe nwoke ọbụla kwere Onyenwe anyị nkwa, maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ọbụla, ọ gaghị emebi nkwa dị otu a. Kama ọ ga-emezu ihe niile dịka o kwuru ya.
3“Ọ bụrụ na nwaagbọghọ nọ nʼụlọ nna ya ekwe Onyenwe anyị nkwa maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ọbụla,
4ọ bụrụ na nna ya anụ mgbe ọ na-ekwe nkwa maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ahụ, ma gba ya nkịtị, onye dị otu a aghaghị imezu nkwa niile ndị ahụ o kwere.
5Ma ọ bụrụ na nna ya ajụ mgbe ọ nụrụ banyere ya na ọ gaghị emezu nkwa dị otu ahụ, mgbe ahụ, nkwa ahụ maọbụ iyi ọ ṅụrụ ga-abụ ihe efu. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya, nʼihi na nna ya jụrụ na ọ ga-emezu nkwa ya.
6“Ọ bụrụ na o mesịa lụọ dị, mgbe ọ ṅụsịrị iyi, maọbụ kwee nkwa nzuzu o kwesiri imezu,