Ọnụọgụgụ 31

Ndị ahụ lụrụ agha ahụ nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha debeere onwe ha.

Numbers 31:53 (UKJV) (For the men of war had taken spoil, every man for himself.)

51Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị ahụ bụ ihe a kpụrụ akpụ site nʼaka ha.

52Ịdị arọ nke ihe ọlaedo niile nke ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha, nke Mosis na Elieza chere nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye, dị narị kilogram na iri itoolu.

53Ndị ahụ lụrụ agha ahụ nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha debeere onwe ha.

54Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị a dị iche site nʼaka ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha na narị ndị agha. E webatara onyinye ndị a nʼụlọ nzute, debe ha nʼihu Onyenwe anyị ka ọ bụrụ ihe ncheta nye Onyenwe anyị nʼihi ndị Izrel niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.