49sị ya, “Ndị ohu gị agụọla ndị niile gara agha nọ nʼokpuru anyị, chọpụta na o nweghị onye ọbụla a na-achọ achọ.
50Ya mere, anyị wetaara Onyenwe anyị onyinye site nʼihe anyị kwatara nʼagha. Onyinye anyị bụ ihe onye ọbụla nwetara, ihe ọlaedo a na-agba nʼụkwụ na mgbaaka, na ọlaaka ikike, na ọlantị na ihe iyi nʼolu niile, i ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onwe anyị nʼihu Onyenwe anyị.”
51Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị ahụ bụ ihe a kpụrụ akpụ site nʼaka ha.
52Ịdị arọ nke ihe ọlaedo niile nke ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha, nke Mosis na Elieza chere nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye, dị narị kilogram na iri itoolu.
53Ndị ahụ lụrụ agha ahụ nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha debeere onwe ha.