47Site nʼoke ndị Izrel Mosis họpụtara otu ụzọ nʼime iri ise, ma mmadụ ma anụ ụlọ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. O nyere ha ndị Livayị na-elekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị mmadụ na anụ ụlọ ndị a.
48Mgbe ahụ, ndịisi agha niile na ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha bịakwutere Mosis,
49sị ya, “Ndị ohu gị agụọla ndị niile gara agha nọ nʼokpuru anyị, chọpụta na o nweghị onye ọbụla a na-achọ achọ.
50Ya mere, anyị wetaara Onyenwe anyị onyinye site nʼihe anyị kwatara nʼagha. Onyinye anyị bụ ihe onye ọbụla nwetara, ihe ọlaedo a na-agba nʼụkwụ na mgbaaka, na ọlaaka ikike, na ọlantị na ihe iyi nʼolu niile, i ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onwe anyị nʼihu Onyenwe anyị.”
51Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị ahụ bụ ihe a kpụrụ akpụ site nʼaka ha.