13Iwe Onyenwe anyị dịịrị ọkụ megide Izrel, o mere ka ha wagharịa nʼọzara iri afọ anọ, tutu ruo mgbe ọgbọ ahụ niile nke mere ihe ọjọọ nʼanya ya nwụchara.
14“Ma lee unu ugbu a, agbụrụ ndị mmehie, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka unu na-eme! Unu na-achọ ime ka iwe dị ukwuu wee Onyenwe anyị megide ndị Izrel.
15Ọ bụrụ na unu ajụ iso Onyenwe anyị ugbu a, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ndị Izrel nọgide nʼọzara. Mbibi na ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha ga-abụkwa nke unu ji aka unu kpatara ha.”
16Ma ha zara sị ya, “Ọ gaghị adị otu a! Anyị ga-ewuru anụ ụlọ anyị ụlọ, tinye igwe ewu na atụrụ anyị nʼime ha. Anyị ga-ewukwara ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị obodo ebe ha ga-anọ.
17Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị Izrel niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu.