Ọnụọgụgụ 32

Ya mere, ha bịakwutere Mosis na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ Izrel, sị ha,

Numbers 32:2 (UKJV) The children of Gad and the children of Reuben came and spoke unto Moses, and to Eleazar the priest, and unto the princes of the congregation, saying,

1Mgbe ndị Izrel rutere ala Jeza na Gilead, ndị ebo Ruben na Gad ndị nwere ọtụtụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ chọpụtara na ala ahụ dị mma nke ukwuu maka ịzụ anụ ụlọ.

2Ya mere, ha bịakwutere Mosis na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ Izrel, sị ha,

3“Ala ndị a: Atarọt, Dibọn, Jeza, Nimra, Heshbọn, Eleale, Sebam, Nebo, na Beon,

4bụ ala nke Onyenwe anyị meriri nʼagha nʼihu nzukọ Izrel, dị mma maka ịzụ anụ ụlọ. Anyị onwe anyị kwa nwere igwe ewu na atụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.