Ọnụọgụgụ 32

“Ala ndị a: Atarọt, Dibọn, Jeza, Nimra, Heshbọn, Eleale, Sebam, Nebo, na Beon,

Numbers 32:3 (UKJV) Ataroth, and Dibon, and Jazer, and Nimrah, and Heshbon, and Elealeh, and Shebam, and Nebo, and Beon,

1Mgbe ndị Izrel rutere ala Jeza na Gilead, ndị ebo Ruben na Gad ndị nwere ọtụtụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ chọpụtara na ala ahụ dị mma nke ukwuu maka ịzụ anụ ụlọ.

2Ya mere, ha bịakwutere Mosis na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ Izrel, sị ha,

3“Ala ndị a: Atarọt, Dibọn, Jeza, Nimra, Heshbọn, Eleale, Sebam, Nebo, na Beon,

4bụ ala nke Onyenwe anyị meriri nʼagha nʼihu nzukọ Izrel, dị mma maka ịzụ anụ ụlọ. Anyị onwe anyị kwa nwere igwe ewu na atụrụ.

5Ọ bụrụ na anyị achọtala amara nʼihu unu, biko, kwerenụ ka akụkụ ala a bụrụ ihe nketa nke anyị bụ ohu unu. Unu emekwala ka anyị soro ndị Izrel gafee nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri Jọdan.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.