6Mosis jụrụ ndị Gad na Ruben ajụjụ sị, “Unu na-ekwu na unu chọrọ ịnọ nʼebe a mgbe ụmụnna unu ndị ikom niile ga-agafe osimiri Jọdan ịlụ agha niile ahụ dị na-eche ha?
7Ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ji eme ka ndị Izrel daa mba ghara ịgafe banye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyerela ha?
8Otu a ka nna unu ha mere mgbe m si Kadesh Banea zipụ ha inyocha ala ahụ.
9Mgbe ha letasịrị ala ahụ si na Ndagwurugwu Eshkọl lọghachi, ha mere ka obi ndị Izrel niile daa mba ịbanye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha.
10Nʼihi nke a Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha nʼụbọchị ahụ. Ọ ṅụrụ iyi kwuo sị,