3Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt,
4mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe.
5Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt.
6Ha hapụrụ Sukọt bịaruo Etam, nke dị nʼọnụ ọnụ ọzara ahụ.
7Ha hapụrụ Etam laghachi azụ gaa Pi Hahirot, nke dị nso nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Baal-Zefọn, ebe ha manyere ụlọ ikwu ha na ndịda ugwu Migdol.