1Ndị a bụ usoro mbili ije ụmụ Izrel, site nʼoge ha hapụrụ Ijipt dịka ha si nọọ nʼigwe nʼigwe. Ọ bụ Mosis na Erọn duuru ha nʼije ndị a.
2Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
3Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt,
4mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe.
5Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt.