10Oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebido na Haza Enan ruo Shefam.
11Oke ala ahụ ga-agbada site Shefam ruo Ribla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Ain. Site nʼebe ahụ, ọ ga-agbasoro ndịda ọdịda anyanwụ Osimiri Galili.
12Mgbe ahụ, ọ ga-aga ogologo ogologo, gbasoro osimiri Jọdan, tutu kwụsị nʼOsimiri Nnu. “ ‘Nke a bụ ala unu, na oke ala ya nʼakụkụ ọbụla.’ ”
13Mosis nyere ndị Izrel iwu sị, “Kesaanụ ala a dịka ihe nketa site nʼife nza. Onyenwe anyị enyela iwu ka enye ya ebo itoolu na ọkara ndị ahụ fọdụrụ.
14Nʼihi na ebo Ruben na Gad tinyere ọkara ebo Manase, enwetalarị ala ihe nketa ha.