14Nʼihi na ebo Ruben na Gad tinyere ọkara ebo Manase, enwetalarị ala ihe nketa ha.
15Ebo abụọ nʼọkara ndị a enwetala ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.”
16Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
17“Ndị a bụ aha ndị ikom m họpụtara ịhụ na e kenyere unu ala ahụ dịka ihe nketa unu. Elieza onye nchụaja, na Joshua nwa Nun.
18Site nʼebo ọbụla họpụta otu onyendu ka ha nye aka ikesa ala nketa ahụ.