Ọnụọgụgụ 35

Nʼoge a, mgbe ndị Izrel ka nọ nʼakụkụ osimiri Jọdan nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu Jeriko, ka Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

Numbers 35:1 (UKJV) And the LORD spoke unto Moses in the plains of Moab by Jordan near Jericho, saying,

1Nʼoge a, mgbe ndị Izrel ka nọ nʼakụkụ osimiri Jọdan nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu Jeriko, ka Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

2“Nye ndị Izrel iwu ka ha nye ndị Livayị ụfọdụ obodo ebe ha ga-ebi. Obodo ndị a ga-abụ ndị si nʼihe nketa ndị Izrel ketara. Nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ na-akpa nri, nke ga-agba obodo ndị a gburugburu.

3Obodo ndị a ga-abụrụ ha ebe obibi, ma ala niile gbara ha gburugburu ga-abụ ebe ịta nri nke igwe ehi na atụrụ, na anụ ụlọ ha niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.