9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
10“Gwa ndị Izrel sị ha, ‘mgbe unu gafere Jọdan banye nʼala Kenan,
11họpụtanụ ụfọdụ obodo ka ọ bụrụ obodo mgbaba ebe mmadụ nwere ike ịgbabanye ma ọ bụrụ na o gbuo mmadụ na-amaghị ama.
12Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ, ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ.
13Obodo isii ndị a unu wepụtara ga-abụ obodo mgbaba.