Ọnụọgụgụ 35

Onye na-abọ ọbọ ọbara ga-egbu ogbu mmadụ ahụ nʼonwe ya mgbe ọbụla o zutere ya.

Numbers 35:19 (UKJV) The revenger of blood himself shall slay the murderer: when he meet him, he shall slay him.

17A sịkwa na mmadụ ejide nʼaka ya nkume nke o nwere ike iji tugbuo mmadụ, ọ bụrụ na ọ tụọ mmadụ nkume ahụ tugbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. Ogbu mmadụ ahụ aghakwaghị ịnwụ.

18A sikwa na mmadụ ji ihe e ji osisi tụọ nʼaka ya, nke o nwere ike i ji tigbuo mmadụ, ọ bụrụ na o tie mmadụ ihe osisi ahụ, tigbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. A ghaghị ime ka ogbu mmadụ ahụ nwụọ.

19Onye na-abọ ọbọ ọbara ga-egbu ogbu mmadụ ahụ nʼonwe ya mgbe ọbụla o zutere ya.

20Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼekworo nuo onye ọzọ aka, maọbụ kpachara anya tụọ onye ahụ ihe nke mere ka ọ nwụọ,

21maọbụ na o sitere nʼobi ọnụma jiri aka ya tie mmadụ ihe nke mere ka ọ nwụọ, a ga-egbu onye ahụ, nʼihi na ogbu mmadụ ka ọ bụ. Onye na-agwachite ọchụ ga-egbu ogbu mmadụ ahụ mgbe ọbụla o zutere ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.