Ọnụọgụgụ 35

“ ‘Ma ọ bụrụ na ogbu mmadụ a ahapụ obodo mgbaba ahụ pụọ, ọ bụrụkwa,

Numbers 35:26 (UKJV) But if the slayer shall at any time come without the border of the city of his refuge, where he was fled;

24mgbe ahụ, ndị ọgbakọ ga-ekpe ikpe nʼetiti onye e boro ebubo na onye na-agwachite ọchụ dịka usoro iwu ndị a si dị.

25Nzukọ aghaghị ichekwa onye e boro ebubo na o gburu mmadụ site nʼaka onye na-agwachite ọchụ, zilaga onye ahụ e boro ebubo nʼobodo mgbaba, bụ ebe ha gbalagara. Onye ahụ e boro ebubo ga-anọgide nʼobodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ, bụ onye ahụ e tere mmanụ nsọ.

26“ ‘Ma ọ bụrụ na ogbu mmadụ a ahapụ obodo mgbaba ahụ pụọ, ọ bụrụkwa,

27na onye ahụ na-abọ ọbọ ọbara achọta ya nʼazụ obodo mgbaba ahụ, o nwere ike igbu onye ahụ e boro ebubo, ikpe igbu mmadụ agaghị ama ya.

28Onye ahụ e boro ebubo na o gburu mmadụ aghaghị ịnọ nʼime obodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ. Ọ bụ naanị mgbe onyeisi nchụaja nwụchara, ka ha nwere ike ịlaghachi nʼụlọ ya, nʼihe nketa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.