23maọbụ tụtuo nkume nke datara dagbuo mmadụ ibe ya mgbe ọ na-ahụghị ya, bụ onye na-abụghị onye iro ya, onye ọ na-ebughị nʼobi imejọ,
24mgbe ahụ, ndị ọgbakọ ga-ekpe ikpe nʼetiti onye e boro ebubo na onye na-agwachite ọchụ dịka usoro iwu ndị a si dị.
25Nzukọ aghaghị ichekwa onye e boro ebubo na o gburu mmadụ site nʼaka onye na-agwachite ọchụ, zilaga onye ahụ e boro ebubo nʼobodo mgbaba, bụ ebe ha gbalagara. Onye ahụ e boro ebubo ga-anọgide nʼobodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ, bụ onye ahụ e tere mmanụ nsọ.
26“ ‘Ma ọ bụrụ na ogbu mmadụ a ahapụ obodo mgbaba ahụ pụọ, ọ bụrụkwa,
27na onye ahụ na-abọ ọbọ ọbara achọta ya nʼazụ obodo mgbaba ahụ, o nwere ike igbu onye ahụ e boro ebubo, ikpe igbu mmadụ agaghị ama ya.