32“ ‘Unu a narakwala ihe mgbapụta site nʼaka onye ọbụla nke gbagara nʼobodo mgbaba, site otu a kwere ka ha lọghachite azụ ga biri nʼala nke aka ha tupu onyeisi nchụaja anwụọ.
33“ ‘Unu emerụkwala ala ahụ nke unu bi nʼime ya. Ọbara igbu ọchụ na-emerụ ala. Ọ dịkwaghị mkpuchi mmehie a ga-eme banyere ala a wufuru ọbara nʼime ya, ma ọ bụghị naanị ọbara nke onye ahụ gburu ọchụ ahụ.
34Unu emerụla ala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya. Nʼihi na mụ onwe m bikwa nʼebe ahụ, mụ bụ Onyenwe anyị bi nʼetiti ụmụ Izrel.’ ”