1Nʼoge ahụ, ndịisi ezi agbụrụ Gilead, nwa Makia, nwa Manase, otu nʼime ụmụ Josef, bịakwutere Mosis na ndị ndu, na ndịisi ezi ụmụ Izrel sị ha:
2“Mgbe Onyenwe anyị nyere unu onyenwe m iwu inye ụmụ Izrel ala ahụ nʼihe nketa site nʼife nza, onye nyekwara gị iwu iwere ihe nketa nwanne anyị nwoke Zelofehad nyefee nʼaka ụmụ ya ndị inyom.
3Ugbu a, ọ bụrụ na ha alụọ ndị ikom Izrel si nʼebo ọzọ, mgbe ahụ, ihe nketa ha ga-abụ nke anapụrụ anyị, tụkwasị nʼihe nketa nke ebo ebe ha lụrụ di. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa anyị ga-abụ nke e wepụrụ ihe site na ya.