Ọnụọgụgụ 36

“Mgbe Onyenwe anyị nyere unu onyenwe m iwu inye ụmụ Izrel ala ahụ nʼihe nketa site nʼife nza, onye nyekwara gị iwu iwere ihe nketa nwanne anyị nwoke Zelofehad nyefee nʼaka ụmụ ya ndị inyom.

Numbers 36:2 (UKJV) And they said, The LORD commanded my lord to give the land for an inheritance by lot to the children of Israel: and my lord was commanded by the LORD to give the inheritance of Zelophehad our brother unto his daughters.

1Nʼoge ahụ, ndịisi ezi agbụrụ Gilead, nwa Makia, nwa Manase, otu nʼime ụmụ Josef, bịakwutere Mosis na ndị ndu, na ndịisi ezi ụmụ Izrel sị ha:

2“Mgbe Onyenwe anyị nyere unu onyenwe m iwu inye ụmụ Izrel ala ahụ nʼihe nketa site nʼife nza, onye nyekwara gị iwu iwere ihe nketa nwanne anyị nwoke Zelofehad nyefee nʼaka ụmụ ya ndị inyom.

3Ugbu a, ọ bụrụ na ha alụọ ndị ikom Izrel si nʼebo ọzọ, mgbe ahụ, ihe nketa ha ga-abụ nke anapụrụ anyị, tụkwasị nʼihe nketa nke ebo ebe ha lụrụ di. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa anyị ga-abụ nke e wepụrụ ihe site na ya.

4Mgbe afọ inwere onwe nye Izrel ruru, a ga-agụnye ihe nketa ha nʼebo ebe ha lụrụ dị. A ga-esi otu a wepụ ala ha site nʼihe nketa nke nna nna anyị ha ketara.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.