Ọnụọgụgụ 36

Nwa nwanyị Izrel ọbụla ketara ala nʼebo Izrel ọ bụla ga-alụ di site nʼagbụrụ ebo nna ya. Ka ala ha ghara ịgafere ebo ọzọ.

Numbers 36:8 (UKJV) And every daughter, that possesses an inheritance in any tribe of the children of Israel, shall be wife unto one of the family of the tribe of her father, that the children of Israel may enjoy every man the inheritance of his fathers.

6Ma nke a bụ iwu Onyenwe anyị na-enye maka ụmụ ndị inyom Zelofehad. Ha nwere ike ịlụ onye ọbụla masịrị ha, ma onye ha ga-alụ ga-abụrịrị onye si nʼagbụrụ ebo nna ha.

7O nweghị ihe nketa ọbụla nʼIzrel ga-esi nʼaka otu ebo gafee nʼebo ọzọ. Nʼihi na ihe nketa nke ebo ọbụla ga-adịgidere ha dịka otu e siri kee ya nye nna nna ha.

8Nwa nwanyị Izrel ọbụla ketara ala nʼebo Izrel ọ bụla ga-alụ di site nʼagbụrụ ebo nna ya. Ka ala ha ghara ịgafere ebo ọzọ.

9Ọ dịghị ihe nketa ọbụla ga-esi nʼotu ebo feere ebo ọzọ. Nʼihi na ebo Izrel ọbụla ga-edebere onwe ha ala ha ketara.”

10Ya mere, ụmụ ndị inyom Zelofehad mere dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.