7O nweghị ihe nketa ọbụla nʼIzrel ga-esi nʼaka otu ebo gafee nʼebo ọzọ. Nʼihi na ihe nketa nke ebo ọbụla ga-adịgidere ha dịka otu e siri kee ya nye nna nna ha.
8Nwa nwanyị Izrel ọbụla ketara ala nʼebo Izrel ọ bụla ga-alụ di site nʼagbụrụ ebo nna ya. Ka ala ha ghara ịgafere ebo ọzọ.
9Ọ dịghị ihe nketa ọbụla ga-esi nʼotu ebo feere ebo ọzọ. Nʼihi na ebo Izrel ọbụla ga-edebere onwe ha ala ha ketara.”
10Ya mere, ụmụ ndị inyom Zelofehad mere dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
11Ụmụ Zelofehad ndị a: Mahla, na Tịaza, na Hogla, na Milka, na Noa, lụrụ ndị ikom si nʼebo nna ha.