Ọnụọgụgụ 36

Ụmụ Zelofehad ndị a: Mahla, na Tịaza, na Hogla, na Milka, na Noa, lụrụ ndị ikom si nʼebo nna ha.

Numbers 36:11 (UKJV) For Mahlah, Tirzah, and Hoglah, and Milcah, and Noah, the daughters of Zelophehad, were married unto their father's brothers' sons:

9Ọ dịghị ihe nketa ọbụla ga-esi nʼotu ebo feere ebo ọzọ. Nʼihi na ebo Izrel ọbụla ga-edebere onwe ha ala ha ketara.”

10Ya mere, ụmụ ndị inyom Zelofehad mere dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

11Ụmụ Zelofehad ndị a: Mahla, na Tịaza, na Hogla, na Milka, na Noa, lụrụ ndị ikom si nʼebo nna ha.

12Ha lụrụ di nʼagbụrụ ụmụ Manase, nwa Josef. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa ha dịgidere nʼebo na agbụrụ nna ha.

13Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ Onyenwe anyị sitere nʼaka Mosis nye ndị Izrel nʼoge ha nọ nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.