Ọnụọgụgụ 4

“Ihe ndị ọzọ niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ ka ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ kekọtaa, jirikwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ha, tụkwasị ha nʼelu ihe e ji ebu ha.

Numbers 4:12 (UKJV) And they shall take all the instruments of ministry, wherewith they minister in the sanctuary, and put them in a cloth of blue, and cover them with a covering of badgers' skins, and shall put them on a bar:

10Emesịa, ha ga-eji akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya na ngwongwo ya niile, tụkwasị ya nʼelu ihe e ji ebu ya.

11“Ha ga-ejikwa akwa anụnụ anụnụ tụsaa nʼelu ebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo mee, werekwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya, tinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu ya nʼoghere dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.

12“Ihe ndị ọzọ niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ ka ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ kekọtaa, jirikwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ha, tụkwasị ha nʼelu ihe e ji ebu ha.

13“A ga-ekpopụ ntụ dị nʼebe ịchụ aja bronz ahụ, jiri akwa na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, sachie ebe ịchụ aja bronz ahụ.

14Emesịa ha ga-atụkwasị ihe niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja ahụ nʼelu akwa ahụ, ihe dịka ite ịgụ ọkụ, na ndụdụ, na ihe ikpofu ntụ, na efere ịkwọsa mmiri niile. Akpụkpọ anụ ehi mmiri ka a ga-eji sachie ha niile. Ma nʼikpeazụ, mkpọrọ osisi e ji ebu ya ka a ga-etinye nʼebe ha kwesiri ịdị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.